Onye prime
minister mba Iraq enyela ndi agha mkpochinti nke no na mpaghara
south Basra iwu ka ha kwsi ikwa mgbo ma chisa ngwa ogu .O no
n’ ubochi Wednesday okwuru okwua nye mkpuru ubochi ato maka ime
nkea, dika ogu na-ada n’ etiti ndi agha otu shiite na nke
govament na- etinye ukwu na mkpuru ubochi abuo .
Ihe butere
iti iwua bu ogu nke malitere ohuru na Basra ma laa ndu madu iri
ano n’ inyi.
Na otu aka
ahu ogu daputakwara Baghdad mgbe ahu gburu madu iri na ise ma
opekata mpe.
Ofu ndi
dika ndi otu ekwekwe nke otu Shiite gbara mgbo ogbunigwe rocket
na Green zone nke mba America na-echekwa, bu nke di na etiti
Baghdad. Nke bu ubochi nke ato ha na- eme nkea nime izukaa.Onye
nkwuchite onu nke ulonochite anya mba America na mba ofesi bu
Mirembe Nantongo kwuru na madu ato nime umuafo mba America
nwetara meru ahu na ya bu mgbo ogbunigwe.
Onye prime
minster nke mba Iraq no na Basra maka ihu na ya bu agha a na-
aluso ndi agha ekwekwe ndia na acho onye nke ga ewere onodu n’ya
bu obodo. Basra bu ya na esote obdo nke kacha were buo ibu na
mba Iraq nke kacha were buo ibu na mba Iraq.
Ka nkea na
aga nihu out onye isi uka out Shiite isi na acho oku bu Muqtada
al-sadr na ebuso mba America nakwa ndi agha mba iraq na bghdad
maka ogu ha na- aluso ndi out Shiite na Basra.