Si Ebea Choo Ihe Ndi Ozo
 

Gaa n'ulo oru anyi

Anabatamgi n'ulo Oru Voice Of Nigeria...........................Oge Ndi Igbo

 

Ndi ji ike ochichi na obodo Tibet anwuchiela mmadu iri abuo na ano a na enyo enyo na ha mere aru gbara okpurukpu ka ndi agha jidere ndi na eme ogbaaghara na efufe isi na ha achoghizi iso mba  China ,bu nke mere ka akwusi nkwado maka egwuegwu Olympic na Beijing.

N’ulooru onye na ekpe ikpe di ‘isiobodo Lhasa kwuru na ndi a na enyo enyo bu ndi anwuchiri maka itinye egwu na onodu nchekwa, iti mmadu ihe, ibufusi ego, isu ulo oku ,na aru gbara okpurukpu ndi ozo bu nke ha mere na ngaghari iwe ubochi Friday kpu oku n’onu.

Nzaghachi azu mba China banyere  ogbaaghara a, amitaghi mkpuru bu nke ndi mmadu na ekwuputa na ha choro ka akwusi mmemme mmepe ihe egwuregwu a n’onwa August.

Oku Olympic a nke ga agafe mba iri na itoolu ga ebido izuuka ozo,ya na nke a ga esi na obodo Tibet gafee bu nke ndi na eme ngaghari iwe nwereike igbochi.

Onye prime minister mba Poland bu Donald Tusk kwuru na o buru na agbanweghi onodu a,goomentiya ga atulee ma ha a ga ezite onye nnochite anya.

Onye na-azo okwa president na mba Amerika bu Barrack Obama agwala mba Amerika ka ha kwuo okwu banyere oke rurun onye na Tibet ka e nwechara nsogbu a.

Ochichi Bush na ndi otu jikoro mba Europe agwala mba China ka nnabichie nke a.

 

 
   
 
 

Home | Contact | VON | Contact Us |
Webmaster@voiceofnigeria.org :Change Password :VON Staff Sign Up
Copyright© 2007. All Rights Reserved Voice Of Nigeria. Developed by: VON ON-LINE

 
 
7255KHz 41m; 9690KHz 31m; 11770KHz 25m; 15120KHz  19m