Ndi mba Iran amalitela ime ntuliakaelu maka
ihoputa ndi ulo omebeiwu nke mba ahu. Ndi mgbanwe anaghi adi mma
na enwe olileanya na ha ga eturu ugo na yabu ntuliakaelu ebe
egbochigoro ndi otu na ama President Mahmoud Ahmadinejad aka n
ihu iso zoo yabu okwaochichi.
Onuogugu ndi mba Iran di nde iriano na ano no na
agbata afo kariri iri na asato bu ndi tozuru oke itu yabu vootu,
dika emepechara gburugburu ebe ndiahu a na achu yabu nta vootu ,ndi
ulo mgbasaozi nke mba ahu malitere igwa ndi mmadu ka ha puta n
igwe tuo vootu iji nweeike merie ndi mpaghara west.