Aka na
achi mba Serbia bu Boris Tadic ekposaala ndi ulo omebeiwu nke
mba ahu,ma na akpo oku maka ime ntuliaka elu na abali iri na otu
nke onwa May.
Yabu onodu
daputara n ihi otu ndorondoro ochichi abuo ibiakota onu ma were
otu obi na aruoru ekewaputara bu nke kpuru afo n ala n izu uka
gara aga, nke onye ndu ha bu prime minister Vojislav Kostunica.
Ka osina
di ndi minister mbaa enwebeghi nkwekorita ma ha aga esi na otu
jikoro mba Europe wezuga onwe ha ma mee njeghari iwe ka ufodu
ndi otu jikotara mba Europe ghota na mba Kosovo bu mba nweere
onwe ya.
Ndi
isiochichi otu jikotara mba Europe mere ka amata na ha nwere
olileanya na ndi otundorondoro ochichi sonyere na otu jikotara
mba Europe ga eturu ugo na yabu ntuliaka elu. Ha kwukwara na
nkea ga eme ka ogbaaghara di n etiti ndi ndorondoro ochichi n
mba ahu bia n njedebe