IGBO
PROGRAMME HIGHLIGHT
(1)
MIXED MUSIC –EGWU AGWARA OGWA (SUNDAY)
Nkea dika njem ana aga n’ime mba uwa gbaa gburugburu site
n’itiputagasi egwu di iche iche nke metututara ndu nakwa
omenala onye, tinyekwara asusu.Oburu na egwu ndia na akpo, onye
nchikota emereme ahu ana ekwu okwu nkowa banyere egwu ahu.Ana
eme egwu agwara ogwa ubochi Sunday.
(2)
HEALTH CORNER—AGHARA NDU KPAA AKU (MONDAY)
Ana esi na emereme a,wee kowaa maka nrianria di iche iche,site
n’ime ka ohanaeze mara uzo esi ebutegasi oya ufodu,etu aga
esi gbochi ya nakwa ogwugwu ya.Anyi na ejekwu ndi dibia bekee
nwere mmuta bu okaibe n’ihe gbasara ahuike,site n’igba
ha ajuju onu
(3)
WOMEN & DEVELOMENT—OGE NDI NNE (TUESDAY)
Anyi echezoghi oru puruiche ndi nne na aru n’obodo nakwa
na ezinaulo.Ewezugagodu oru ha na aru dika nwunye nakwa nne,ha
na arukwaazi oru n’ikwalite mepe nakwa agamnihu n’ime
ogbe di iche iche.Ebumnuche anyi bu ikpokoba ndi nne olemole,ka
ha nwee ike tunye onu na okwu ufodu na adaputagasi na ezinaulo.
(4)
GOVERNANCE IN NIGERIA-- OCHICHI OBODO NIGERIA (Wednesday)
Site na emereme anyi a bu ochichi ala Nigeria,anyi na ezute ndi
isi ochichi goomenti ,ndi ndorondoro ochichi,ndi eze odinala maobu
ndi isi ulo akwukwo mahadum.Anyi na-eme ka ha kowaa maka oru ha
na-aru iji kwado goomenti.
(5)
IGBO CULTURE & TRADITION—NDU NDI IGBO (THURSDAY)
Ndu ndi igbo bu out n’ime emereme anyi na achikoba iji wee
kwado ntoala nke omenala ndi Igbo.Ona arutuaka na omenala nakwa
etu ndi agburu Igbo si ebi ndu.
(6) PERSONALITY PROFILE—ARUO NA ANWU (FRIDAY)
Ihe emume anyi a bu Aruo na Anwu na egosi umuafo Igbo ruputagoro
oru gbara okpurukpu site n’idi ike oru.Anyi na esi na nkowa
ndia di otua a nyere anyi mee ka ndi di otua nyere anyi mee ka
ndi na eto eto lekwasi ha anya.
(7) NIGERIA THIS WEEK—IZU AGBA AKA (SATURDAY)
Ihe emume a na egosi ihe ufodu digasi mkpa mere na-ala Nigeria
kwa izu-uka obula.