Senate ala
Naijiria ekwuola na o ga-ehibekwa otu komiti ga-elebaghari anya
n’iwu ochichi ala naijiria nke afo 1999, n’onwa ozo na-abia
abia.
Osote
onyeisi nke ndi uloomebe iwu a bu Chief Ike Ekweremadu kwuputara
nkea oge o na-aza ajuju sitere n’aka ndi ntaakuko n’Umuahia
isiobodo ke steti Abia.
O kowara
na ihe butere igbu oge n’imalite ya bu oru bu maka na ha gbadoro
anya n’ihu na e weputara akwukwo bill gbasara uzo a ga-esi mefuo
ego nke afo puku abuo na asato, bu nke no ugbua na-eche mbianye
aka nke onyeisiala.
Dika o si
kwuo ndi ulo omebeiwu ke steti ga-esonye n’oru ilebagharianya
n’iwu a.
A biakwanu
n’ihe gbasara ikewaputakwu steti ndi ozo n’owuwaanyanwu nke ala
Naijiria, Chief Ekweremadu kowara na mpaghara ahu ga-enweta ezi
osisa n’ihi na ndi senator si mpaghara ahu na-aruko oru onu iji
hu na e nweetara nke ahu.
Ala
Naijiria ehibela otu komiti mba uwa maka omumu banyere sayensi
iji kwalite mmepe ala Naijiria.
N’akwukwo
ozi nke onu na-ekwuchitere ndi otu a kporo National
Mathematical Centre ma o bu NMC n’aha bekee , bu Njoku Onyekachi
kwuru na otu a bu nke onye minister na-ahu maka agumakwukwo bu
Dokita Igwe NWACHUKWU hibere siri na nke a ga-abu otu ndumodu
nyere NMC.
Onye
minister a kwuru na komiti a bu uzo goomenti no ugbu a jiri choo
idozi ihe ndi emetaghi nke oma n’oge gara aga ma mee ka obodo
mezuo ihe ha bu n’uche maka afo puku abuo na iri abuo.
O
choputara na etinyere ego na sayensi na nkanuzu bu nke bu
isisekpu nti n’inweta ebumnuche nke NEPAD,ya na imejuputa nzube
banyere millennium a. Okwuru na itinye ego na sayensi bu ihe di
mkpa maka mba ndi ndi na-emepe emepe.
Onye
minista a kwuru na ala Naijiria choro inwe ntolite, akunuba na
mmepe. O kwuru na o di mkpa na a ga-akwalite ime nkeoma na
sayensi na nkanuzu n’ala Naijiria.