|
Taa ka ndi uka Christ n’ uwa
gbagburugburu na- emerube mmeme Good Friday ya bu otu ubochi nso n’
ubochi eji echeta onwu Christ nwuru n’ elu obe nke calvary maka
umu mmadu.
Ya bu mmeme bu otu mmeme na-esotebe
mmeme Easter.Ana eme mmeme n’ otutu ulo uka ndi Christ maka icheta
ahuhu n’ onwu nke Christ.Mmeme ndia gunyere ekpre na abu.
Chioma ibeegbulem bu Out onye
ukochukwu sitere Our Lady of Lord Catholic Church di na Lagos
mpaghara south west nke ala Nigeria nyere nkowa gbasara ihe ejiri
kpo ubochia Good Friday.
Ndi mmadu no ugbua na- ekwuputa
echiche ha gbasara nkabgu uloikpe tribunal kagburu ntuliakaelu
ejiri hoputa onye govano nke steeti Edo.
Ya bu tribuna kwuru na obu Adams
Oshiomole ga abuzi govano na ya bu steeti di na mpaghara
southsouth nke ala Nigeria.
Mazi Oshimole jibu okwa dika onye ndu
nke out jikotara ndi olu n’ ala Nigeria.
Onye no ugbua dika onye ndu nke otu
jikotara ndi oru n’ ala Nigeria bu comrade Abdul Wahid Ibrahim no n’
ubochi Thursday zigara Oshiomole ozi ekele maka ya bu mmeri nke
nwetara n’ya bu uloikpe tribunale hibere gbasara ntuli akaelu eji
hoputa govano n’ steeti Edo.
Na ozi o si na Geneva ebe ojere
nzukonke otu ndi oru n’ uwa gbagburugburu zibata o kwara na ya bu
mmeri dika ihe putara ihe na mbo a na- agba iweta ochichi anye kwuo
uche ya n’ ala Nigeria.
O gara nihu kele ya bu otu tribunal
maka ikwuba aka ha oto.
Okwuru ozo na steeti Edo ga ahuta
govamenti nke bu ndi o na- achi n’ obi.
Adams oshiomole nke onye otu party
Action Congress na onye jibu okwa onye ndu nke otu jikotara ndi oru
n’ ala Nigeria ka ekwuziri na o ga bu govano steeti Edo di na
mpaghara southsouth nke ala Nigeria.Uloikpe tribunal kwuru n’ ubochi
thursday na o bu ya meeriri n’ ntuliakkaelu emere n’ afo gara aga
maka iweputa onye govano na steeti Edo. |