Si Ebea Choo Ihe Ndi Ozo
 

Gaa n'ulo oru anyi

Anabatamgi n'ulo Oru Voice Of Nigeria...........................Oge Ndi Igbo

 

Ngwa gerezie akuko anyi n’uju ya malite n’akuko si ala Naijiria, oko akuko bu Chinwe Anosiki. 

Goomenti ala Naijiria ehiwela otu komiti ntuputa iji hu na onuogu ndi ala Naijiria ga-eje ma sonyekwa n’emereme nkeogbako ezumezu mba uwa maka mmanu petrol ma o bu World Petroleum Congress, WPC N’Aha  bekee , bu nke ga-adi na Midrib, nke mba Spain. 

Onyeisioche nke otu komiti ntuputa a ma burukwa onye Group General Manager, na ngalaba Group Public Affairs, n’ulooru nke Naijirian Petroleum Corporation, bu Dr. Levi Ajuonuuma, kwuputara nke a oge ya na ndi ntaakuko anyi na-akparita uka na Lagos  

mpaghara south west nke ala Naijiria. 

Isiokwu nke ogbako ezumezu nke afo a bu ‘Uwa na-eme Ngafe:Inye Oku Maka Nnagide nke Ntolite.`Aturu anya na o ga-achikota ntolite onuogu ndi mmadu, inye oku na idinotu nke uwa.

Ajuonuma   kwuputara na ala Naijiria dika out n’ime mba ndi kacha aruputa mmanu na gas na mba uwa dum nwere oru di mkpa o ga-aru n’ihu na e nwere nnagide n’inye oku nakwa  n’onu di ala.

O kowakwara na ogbako ezumezu a ga-enyere ndi ala Naijiria ohere igosiputa atumatu onye isi ala Naijiria a kporo seven-point agenda ka ndi na-azu ahia mmanu wee huru, nke ebumnobi ya bu iji dota ndi ahia mmanu ka ha bia tinye ego ha n’ala Naijiria.

Akwadoro ka ogbako ezumezu nke out WPC a agba nke iri na itoolu ya  bukwa nke a na-eme out mgbe n’onwa ano, ka o din a Madrid, Spain, malite n’abali iri abuo na itoolu nke onwa June ruo abali ato nke onwa July. 

Uloikpe na-ahu maka mkpesa gbasara ntuliakaelu na steti Edo nke south ala Naijiria, ga-enye mkpebi ikpe taa gbasara akwukwo ahu nke onye nochitere anya out party Action Congress n’okwa onye govano gbara maka ntuliakaelu nke onwa April n’afo gara aga.

Comrade Adams Oshiomhole gbara akwukwo maka nhoputa a hoputara Oserheimen Osundor nke party Peoples Democratic Party dika onye mmeri na ya bu ntuliakaelu.

Govano Ounbor ariolarii uloikpe a ka o leghara akwukwo ahu anya n’ihi na o nweghi isi ma na-akowakwa na a hoputara ya site na ntuliakaelu n’uzo mkwumoto n’onwa April ahu.

Na mburi n’ubochi Wednesday ka e zigara nari kwuru nari ndi uweojii na  steti Edo iji hu na ogbaghara o bula adaputaghi.

 
   
 
 

Home | Contact | VON | Contact Us |
Webmaster@voiceofnigeria.org :Change Password :VON Staff Sign Up
Copyright© 2007. All Rights Reserved Voice Of Nigeria. Developed by: VON ON-LINE

 
 
7255KHz 41m; 9690KHz 31m; 11770KHz 25m; 15120KHz  19m