Taa ndi
uka alakuba na emerube mmemme Eid-el Maolud bu nke ha ji echeta
omumu onye amuma Muhammad.
Ha ji taa
agu akwukwo Qur’an, nke bu ihe okputaraokpu onye amuma a hapuuru
ha, tinyere igu akwukwo Islam ndi ozo ma n’abali, ma n’ ututu
nke abali iri na abuo nke Rabiul Awwal,nke bu onwa ato na
kalenda ndi okpukperechi Islam.
Ochichi
ala Naijeria enyela ubochi taa dika ubochi ezumike iji merube
mmemme a.
Uloikpe
ukwu ala Naijeria di na- Abuja ,isiochichi ala anyi enyela
goomenti iwu ka o nye Philip Morris International nke mba
Switzerland akwukwo iwuchi n uloikpe.
E nyere
iwu a n’ihi mkpoliteghari ikpe akpolitere akwukwo goomenti gbara
ulooru a,na-aju ka enye ya ijeri kwuru ijeri naira ise na-uma
ato, n’ihi ihe utaba ha mere umuntorobia na umuaka ka n’eto-eto
na ala Naijeria.
Okaiwu
Binta Murtala-Nyako nyere ntuziaka ka ahu na etinyere okwu
gbasara yabu akwukwo a gbara ulooru a n’ obosara akwukwo
mgbasaozi mba Switzerland
Ulo
omebeiwu ala Naijeria emeela ka amata na ya nwereike inye ndi o
gbasara ntaramahuhu banyere ugboelu ahu a na-acho-acho. O nyere
ha abali abuo ichota ugboelu ahu.
Onye
isioche komiti ulo omebeiwu na ahu maka njem ugboelu, Chief
Anyim Udeh mere ka amata nke a no ogboala ndi ulo omebeiwu na
Abuja.
Omekwara
ka amata na ngalaba ahu nwere nsogbu nke ha na akwado itinye
anya nay a.