|
Ndi ulo omebeiwu nke mba Amerika
etoola akaoru ndi ulooru na-ebuso mpu na nruruaka agha n’ala Nigeria
a kporo Economic And Financial Crime Commission,
Maobu EFCC n’aha ichafu.
N’okwu ya n’oge ndi out a biara njem
nleta n’isi ulooru a di n’Abuja ,out onye n’ime
ndi otu ahu kowara na akaoru EFCC
masiri ha,ma kwuputakwa nkwadebe ha di ,bu ha ulooru a idi na-aruko
oru onu n’ichu mpu na nruruaka oso ukwu eru ala.
Ndi otu a, nke onye ndu ha bu onye
amabasado mba Amerika n’ala Nigeria bu Robin Renee Sanders,kwetara
na ulooru EFCC aruola oru a huru anya n’ichu nruruaka oso.
Ibrahim Lamorde, nke bu onye
onochiteanya onyeisioche nke ulooru a, bukwa onye duuru ufodu ndisi
nke ulooru ahu wee jee nabata ndi obi ahu, kowara na goomemti
etiti ala Nigeria hiwere ulooru EFCC
n’ihi na ibupu ego mba ofesi nakwa mpu ndi
Ozo a na-eme n’uzo ego na-akawanye
njo.
O gara n’ihi kowaa na ulooru a
aruputala otutu ihe a huru anya n’uzo ichu nruruaka
oso kemgbe e hiwere ya, ma rutu aka na
mmepe e mepere ngalaba ozo a akporo
Nigeria Financial Intelligent Unit iji
wee na-egwu chandum.
O kowakwara ndi obia a na ulooru EFCC
nwere ikike nwereonwe n’ibuso mpu na
Nruraka agha ma rutukwa aka na ha
nwere ike ikpachi onye obula dara iwu.
Onye minister mmiri na oru ugbo di
n’aka n’ala Nigeria bu Dokita Abba Ruma noro
Taa bu ubochi Tuesday gwa ndi nta
akuko okwu gbasara mmerube ubochi mmiri gbaa gburugburu uwa ma o bu
World Water Day ,ya bu WWD n’aha bekee ,bu nke
ga-adi n’abali iri na asato nke onwa
March n’afo a, tinyere ihibe afo idebe gburugburu mba uwa ocha.
Onye onochiteanya nke out UNICEF n’ala
Naijiria bu Maazi Ayalew Abai, tinyekwara ndi isi nke ulooru otu
jikoro mba uwa di iche iche n’ala Naijiria ,otu kwuru onwe ha di
iche iche nakwa ndi ozo o metutara ga-esocha wee bia ya bu mmepe.
Mba niile jikotara aka onu wee mebe
otu UN ,noro n’onwa December nke afo puku abuo na asaa, kwuputa na
abali iri abuo nke onwa March afo obula ,ga –abu ubochi
mmiri gbaa gburugburu uwa ,iji kwuo
nke oma mkpa ezi mmiri onunu di na ndu m madu.
|