Si Ebea Choo Ihe Ndi Ozo
 

Gaa n'ulo oru anyi

Anabatamgi n'ulo Oru Voice Of Nigeria...........................Oge Ndi Igbo

 

Uloomeiwu nke ala Nigeria  akowala ijeri dolla isii akwuru onye orungo akpotara maka ulo ngbanwuoku nkeBenin na Asaba dika ihe itunanya ,nihi na nkea amitaghi mkpuru obula. 

Nkea ka ha kwuputara ka nkpesa na- a ga- nihu maka ya nakwaajo onodu oku latric n’ ala Nigeria tinyegoro ukwu n’ mkpuru ubochi ano. 

Oru ngoa enyere makaulooru mgbanwuoku nkeBenin Asaba Agbo  nakwa Calaba bu ulouru Pivot Engineering company ka enyere ya n’ onwa march afo puku abuo na asaa. 

Ego oru ngoa  putara ijeri dolla ano na uma asato.Na otu aka ahu aturu anya na o ga arucha ya bu oru ngo n’ onwa December nke afo puku abuo na asaa. 

Enyere onye oru ngoa ego di ijeri dolla ato na uma isii ka owere malite oru.

N’ okwu ya gbasara ka osiri mefuo ego, onyeisi ya bu ulooru bu mazi  Dave Obre kwuru na ulooru ya arugo ihe  rururu pacenti iri ato na itolu ; mana onye isi ulooru National Independent Power Project NIPP bu mazi James  Olotu kowara na o bu nani pacenti iri ka ha rugoro oru ruo n’ ya bu orungo. 

Ihe itunanya mere mgbe mazi Michael gbolum Okunchi kwuru na enweghi ihe na enweghi ihe putara ihe arugoro n’ ebe ndia. 

Gbolum okunchi bu onye ezigara imara ka oru si aga n’ ebe ndia

Ndi agha nke  ugboelu nke ala Nigeria anatara okpu ekele maka iwu uloakwukwo na- akuzi ihe omumu nka na uzu .onye minister okwu nchekwa di n’ aka n’ ala Nigeria bu Alhaji Yayale Ahmed nyere okpu ekelea mgbe a na-ehibe ya bu uloakwukwo.Okwuru na uloakwukwoa ga enye nzere degree n’ ihe omumu air space science ,engineering nakwa technology site na njikoakaonu nke mahadum Cranfield di n’mba United Kingdom

Okwuru na uloakwukwoa ga enyere ndi agha ugboelu nakwa ngalaba njem ugboelu aka n’ inwe ikike agha. 

Ahmed gara nihu kwuo na o bu ihe putara  ihe na mahadumCranfield nke amama n’ihe omumu engineering ,air  space management and design ga etinye aka n’ihe omumua. 

Onye ministera  kwere nkwa na govoment etiti ga akwalite ya bu ulo akwukwo n’ogo’ nke ibe ya ndi enwere n’ mba uwa ndi ozo

Uloikpe- nkpeghari- ikpe  di n’ Ibadan mpaghara southwest nke ala Nigeria akagboola ikpe nke uloikpe tribuna kpere gbasara akwukwo otu party ANPP nke ala Nigeria gbara megide ntuliakaelu emere n’ steeti Ogun maka ihopta onye govano nke steeti ahu 

Onye ji aha otu party ANPP zo okwa govano n’ ya bu steeti bu senator Ibikunle Amosu gbara akwukwo megide mmeri govano Gbenga Daniel  meriri n’ ntuliakaelu nke emere n’ ubochi iri na ano nke onwa April afo 2007 maka nhoputa govano steeti Ogun di n’ mpaghara Southwest nke ala Nigeria 

Okwuru na nkea juputara n’ nruruaka

Ya bu uloikpe tribuna tupuru ya bu akwukwo ikpe nke Amusi gbara site na ikowa na mazi amusi enyeghi ezigbo nkowa gbasra  otu party ya tinyekwara ihe ufodu di nkpa.

Ya bu tribuna kowara na obu nkea mere ka okwua ghara ichita aja.

 
   
 
 

Home | Contact | VON | Contact Us | archive
Webmaster@voiceofnigeria.org :Change Password :VON Staff Sign Up
Copyright© 2007. All Rights Reserved Voice Of Nigeria. Developed by: VON ON-LINE

 
 
7255KHz 41m; 9690KHz 31m; 11770KHz 25m; 15120KHz  19m