Uloomeiwu nke ala Nigeria akowala ijeri dolla
isii akwuru onye orungo akpotara maka ulo ngbanwuoku nkeBenin na
Asaba dika ihe itunanya ,nihi na nkea amitaghi mkpuru obula.
Nkea ka ha kwuputara ka nkpesa na- a ga- nihu
maka ya nakwaajo onodu oku latric n’ ala Nigeria tinyegoro ukwu
n’ mkpuru ubochi ano.
Oru ngoa enyere makaulooru mgbanwuoku nkeBenin
Asaba Agbo nakwa Calaba bu ulouru Pivot Engineering company ka
enyere ya n’ onwa march afo puku abuo na asaa.
Ego oru ngoa putara ijeri dolla ano na uma
asato.Na otu aka ahu aturu anya na o ga arucha ya bu oru ngo n’
onwa December nke afo puku abuo na asaa.
Enyere onye oru ngoa ego di ijeri dolla ato na
uma isii ka owere malite oru.
N’ okwu ya gbasara ka osiri mefuo ego, onyeisi ya
bu ulooru bu mazi Dave Obre kwuru na ulooru ya arugo ihe
rururu pacenti iri ato na itolu ; mana onye isi ulooru National
Independent Power Project NIPP bu mazi James Olotu kowara na o
bu nani pacenti iri ka ha rugoro oru ruo n’ ya bu orungo.
Ihe itunanya mere mgbe mazi Michael gbolum
Okunchi kwuru na enweghi ihe na enweghi ihe putara ihe arugoro
n’ ebe ndia.
Gbolum okunchi bu onye ezigara imara ka oru si
aga n’ ebe ndia
Ndi agha nke ugboelu nke ala Nigeria anatara
okpu ekele maka iwu uloakwukwo na- akuzi ihe omumu nka na uzu
.onye minister okwu nchekwa di n’ aka n’ ala Nigeria bu Alhaji
Yayale Ahmed nyere okpu ekelea mgbe a na-ehibe ya bu
uloakwukwo.Okwuru na uloakwukwoa ga enye nzere degree n’ ihe
omumu air space science ,engineering nakwa technology site na
njikoakaonu nke mahadum Cranfield di n’mba United Kingdom
Okwuru na uloakwukwoa ga enyere ndi agha ugboelu
nakwa ngalaba njem ugboelu aka n’ inwe ikike agha.
Ahmed gara nihu kwuo na o bu ihe putara ihe na
mahadumCranfield nke amama n’ihe omumu engineering ,air space
management and design ga etinye aka n’ihe omumua.
Onye ministera kwere nkwa na govoment etiti ga
akwalite ya bu ulo akwukwo n’ogo’ nke ibe ya ndi enwere n’ mba
uwa ndi ozo
Uloikpe- nkpeghari- ikpe di n’ Ibadan mpaghara
southwest nke ala Nigeria akagboola ikpe nke uloikpe tribuna
kpere gbasara akwukwo otu party ANPP nke ala Nigeria gbara
megide ntuliakaelu emere n’ steeti Ogun maka ihopta onye govano
nke steeti ahu
Onye ji aha otu party ANPP zo okwa govano n’ ya
bu steeti bu senator Ibikunle Amosu gbara akwukwo megide mmeri
govano Gbenga Daniel meriri n’ ntuliakaelu nke emere n’ ubochi
iri na ano nke onwa April afo 2007 maka nhoputa govano steeti
Ogun di n’ mpaghara Southwest nke ala Nigeria
Okwuru na nkea juputara n’ nruruaka
Ya bu uloikpe tribuna tupuru ya bu akwukwo ikpe
nke Amusi gbara site na ikowa na mazi amusi enyeghi ezigbo nkowa
gbasra otu party ya tinyekwara ihe ufodu di nkpa.
Ya bu tribuna kowara na obu nkea mere ka okwua
ghara ichita aja.