Dika out
komiti ehiwere n ulo nnochita anya na ahu maka oku latrik na
igwe eji enye oku na aga n ihu n inyocha okpurukpu ego ochichi
gara aga mefuru n enweghi mkpuru obula o miputara, ndi ulo
omebeiwu akowaputala mgbasa ya banyere igwe oku latrik e hiwere
na Abuja kemgbe afo 1999 n enweghi ihe obula o na emeputa.
Obi adighi
out komiti ahu mma gbasara akwukwo onye nlekota ulo oru Power
Holding Company of Nigeria, Alhaji Shuaibu Maigida detaara ya
banyere okwu oku na Abuja.
Onye
isioche yabu otu komiti, mazi Ndudi Godwin Elumelu kowara mgbasa
ya banyere ijeri dola abuo na uma ise e nyere ndi orungo ahu,n
ime ijeri dola ato a mawaputara maka yabu oru, nke n enweghi ihe
obula ha nwere igosi maka ya. O kwere nkwa na out komiti ahu ga
ahu na o naputara ndi orungoa yabu ego.
Ulo
nnochita anya ala Nigeria akowaputala ntukwasaobi ya gbasara
onye isiala,Yar Adua ibianye aka n akwukwo ego mmawaputa nke
afoa e mezighariri,ka o buruzie iwu.Mazi Festus Adegoke,bu onye
isioche otu komiti ulo nnochita anya na ahu maka yabu biilu
kwere nkwa na onye isiala ga abianye aka na yabu akwukwo.
Onye
isioche out komiti ulo nnochita anya na ahu maka ego bu mazi
John Eno siri na ebe ndiozo ha meziri na akwukwo ego mmawaputa
ahu gunyere uzo gooment siri akpata ego.
N okwu nke
ya, onye isioche out komiti ulo nnochita anya na ahu maka
usoroiwu nakwa azumahia,chief Ita Enang mere kaamata na ihe onye
isiala mere abughi igosi ikike ya na yabu ego mmawaputa.
Justice
Idris Kutigi bu onye chief justice nke ala Nigeria akpokuola ndi
okaiwu niile na ala Nigeria ka ha sepu aka n ihe obula nwereike
ikpu aha ha n aja iji nweeike ibuso mpu na arurumala ndiozo agha
nkeoma.
Kutigi
nyere ndumodua n ogbako abali ato ndi ulooru Economic and
Financial Crimes Commission haziri maka ndi okaiwu si mpaghara
mba West Afrika n isiochichi ala Nigeria bu Abuja.
O mere ka
o doo anya na soso ma ndi okaiwu na uloikpe a gbupuru onwe ha n
ihe ndiahu nwereike imechu aha ha, na ogu ahu a na ebuso mpu na
ala Nigeria na mpaghara mba Afrika ga abu nke kpuru afo na ala.