Mba Egypt
na mba Rusia ebinyela aka na akwukwo nkwekorita ga enye mba
Rusia ohere itinye akwukwo maka orungo, ulorumgbanwu akporo
nulear plant bu nke achoro iru n’ mba Egypt. Ya bu oru ngo
juputara n’ uru ahia.
Emere ya
bu nkwekorita ka onye president mba Rusia bu Vladimir Putin na
ogbo ya nke mba Egypt bu Hhosni Mubarak zukochara n’ agiga
isiobodo mba Rusia maka mkparita uka .Ya bu mkparita uka
lebakwara anya na atumatu govament mba Rusia ikpo nzuko udo maka
mpaghara Maddle East.
Mazi
Mubarak gwara ndi ntaakuko na- mba Egypt ga esite na mekorita na
nkwekorita nke ndi otu ya na mba uwa nakwa nke out Intenational
Atomic Energy Agency were hibe ngalaba nke ulomgbanwuoku nke
gbadoroukwu na nuclear energy.
Mba Egypt
choro iru ulomgbawuoku ano nke ga gbadoro ukwu na nuclear. Ya
bu nkwekorita emere n’ ubochi Tuesday ga enye ndi orungo nke
mba Russia ohere itinye akwukwo maka iru ya bu ulo orungbanwu
oku.