Ochichi
mba Comoros akpachiela isiochichi onodu ndi agha nnupuisi n’oke
ala mmiri gbara gburugburu Anjouan.
Nke a diri
ire mgbe otutu awa gachara ndi agha otu jikotara mba Afirika
wakporo mpaghara ahu ma weghara ochichi n’aka Colonel Mohamed
Bacar were ochichi n’aka ike n’onwa May gara aga.
Mkpamkpa
malitere kpawa ka ndi agha ahu ji isi ututu wakpo ya bu
mpaghara. Onwebeghi akuko anyi natara gbasara ndi e gburu na ya
bu mwakpo.
Onye Chief
of Defence Staff bu Mohamed Dosara siri na onwedughi oke nsogbu
ha nwere iweghara mpaghara ahu.
Ka o di
ugbu a anyi nuru na a na-acho Bacar acho.