|
Kofi Annan jibu okwa dika onye
odeakwukwo ukwu ke otu mba uwa akwasaala ntuputa ndi mmadu na ya
nwereike inabata oru ibu onye okpe udo na ogbaaghara ahu na afio
n’mpaghara Darfur nke mba Sudan.
Out ndi isiekwe onwu akporo Justice
and Equality Movement (JEM) ekwuola na ha choro ka ha na ochichi mba
Sudan noro ihu na ihu kparia maka udo, nke ha siri na o bu Annan ga
ano n’isi oche.
Annan mere ka o doo anya na enweela
ndi aka siri ike na eleba yabu okwu anya,nke okwesiri ka ahapu etu
ahu.
Jan eliasson,onye ozi puruiche nke otu
mba uwa, na Salim Ahmed Salim nke otu jikotara mba Afirika,bu ha na
etinye onu na yabu okwu.
Mazi Annan mere ka amata nay a agwala
Salim, na Eliasson ihe ndi isiekwe onwu ahu kwuru;o gwakwara ha ka
ha jide nke ha ji.
Kemgbe Eliasson na Salim na-agba mbo I
kpokota ndi isiekwe onwu a maka mkparita uka udo sooso imerime n’ime
ndi isiekwe onwu a kwetara ibiakota onu.
Ndi mba uwa tara amuosu kowara na ihe
ruru nari puku mmadu abuo anwuola kemgbe ogu ahu malitere,ebe nde
ndi mmadu abuo na ise bu ndi gbafugoro n’oso ndu. |