Si Ebea Choo Ihe Ndi Ozo
 

Gaa n'ulo oru anyi

Anabatamgi n'ulo Oru Voice Of Nigeria...........................Oge Ndi Igbo

 

Otu jikoro mba uwa ekwuola na ndi kacha mee aru mgbe e nwere ogbaaghara bu nke ntuleakaelu e mere na mba Kenya kpatara, bu ndi agaghi anata mgbaghara obula.

N’ozi eweputara ubochi Wednesday, ndi oru otu jikoro mba uwa gwara mba Kenya ka ha taa ndi niile megidere oke ruru onye ahuhu tinyere aru ndi uwe ojii kpara.

Ozi a natara na-akowa n’ihe akaebe ha nwetara na-aru ndi uweojii aka na o bu kpatara onwu niile bu nke e ji egbe were gbuo ka mba ahu mechara ntuleakaelu bu nke butere ogbaaghara.

Onye ndu na agba goomenti ukwu bu Ralia Odinga na president  Mwai Kibaki na ekwuputa na o bu ha meriri na ntuleakaelu maka okwa onyeisiala n’onwa December abali iri abuo na asaa, bu nke otutu mmadu nwuru n’ime ya.

Ihe kariri mmadu otu puku ka e gburu na ogbaaghara a, bu nke biaziri gho esemokwu agburu ya na nke kpatara izo ala na onodu akunauba  iha nhatanha .

 

 
   
 
 

Home | Contact | VON | Contact Us |
Webmaster@voiceofnigeria.org :Change Password :VON Staff Sign Up
Copyright© 2007. All Rights Reserved Voice Of Nigeria. Developed by: VON ON-LINE

 
 
7255KHz 41m; 9690KHz 31m; 11770KHz 25m; 15120KHz  19m