Si Ebea Choo Ihe Ndi Ozo
 

Gaa n'ulo oru anyi

Anabatamgi n'ulo Oru Voice Of Nigeria...........................Oge Ndi Igbo

 

Onye odeakwukwo ukwu nke otu jikotaramba uwa bu Ban-Ki-Moon ariola mba uwa di iche iche ka ha tou ntoala udo na mba Somalia site n ikwalite mbo ndorondoro ochichi nke otu jikotara mba uwa na-agba,ma hu na ekpogakwuru ndi agha siri ike site na mba di iche iche onuogu ha ga-adi puku asato. 

O kowara na nke a ga- enye aka mee ka akpoghachi ndi agha mba Ethiopia ahu dunyere mba Somalia ukwu na mmeri ha meriri ndi agha uka alakuba n onwa Disemba nke afo puku abuo na isii, ma meekwa ka e kpotekwuo ndi agha nke otu jikotara mba uwa ga-eru puku iri abuo naasaa,nakwa ndi uwe ojii ga-eru otu puku na nari mmadu ise. 

N’ozi e ziteere otu council nchekwa bu nke noro odu wee rute ha aka,Ban kowara na otu jikotara mba uwa na-akwalite atumatu ato di iche iche iji wee kpalite mkparita uka n’etiti goomenti nchereoge nke mba Somalia nakwa otu ndi ozo na agba goomenti ukwu. 

Onye odeakwukwo a kwuru na ebumnobi nke a bu iji hu na e nwere nchekwa,obuladi tupu enwee nkwekorita ikwusi ikwa mgbo,iji kwalite ulooru goomenti di iche iche,otu enyemaka di iche iche,nakwa iji kwalite akunuba.

 

 
   
 
 

Home | Contact | VON | Contact Us | archive
Webmaster@voiceofnigeria.org :Change Password :VON Staff Sign Up
Copyright© 2007. All Rights Reserved Voice Of Nigeria. Developed by: VON ON-LINE

 
 
7255KHz 41m; 9690KHz 31m; 11770KHz 25m; 15120KHz  19m