Si Ebea Choo Ihe Ndi Ozo
 

Gaa n'ulo oru anyi

Anabatamgi n'ulo Oru Voice Of Nigeria...........................Oge Ndi Igbo

 

President mba sudan bu Omar al Bashir na President mba Chad bu Idris Derby etinyela aka n akwukwo maka nkwekorita udo bu nke elewere anya na o ga eme ka ndiagha isiekwe onwu nke mba Chad kwisi iwakpo ndi mba Sudan n mpaghara ebe ha na ndi mba Chad si aga mba ozo.  

Ndi akaebe no mgbe mba abuoa bianyere aka n akwukwo gunyere onye odeakwukwo otu jikoro mba uwa bu Ban Ki-moon na onyeisi otu jikotara ogbako ndi Islam bu Ekmeleddin Ihsanoglu. 

E mere ka amata na site n nkwekorita mba abuoa eji mmeputa mmanu akuchinyere mara,na ha ga ahazighari mmekorita ha,ma wetakwa okwu na uka di n etiti ha n njedebe. 

President mba Kenya bu Mwai Kibaki bu onye ntinye etinyeghariri ya n okwaochichi wetara ogbaaghara n mba ahu ahoputala otu komishonu ga enyocha ntuliakaelu emere n abali iriabuo na asaa nke onwa Decemba. 

N akwukwo ozi si n isi ulooru Kibaki,o kowara na komishonua ga eleba anya n ntuliakaelu niile e mere, okachasi n ntuliakaelu e mere maka nhoputa onye isiala nke mba ahu. 

E mere ka amata na otua ga etinyekwu anya n akwukwo ntuliakaelu di icheiche imata ma ha adabara n usoro,iji mara ma etu okwe siri gbaa e weputara o bukwa nke kwuoto, tinyere nwereonwe nke ulooru na ahazi ntuliaka n mba Kenya na ihe ndiozo. 

Ntuliakaelu ahu e mere n mba Kenya bu nke butere ogbaaghara gburu ihe kariri otu puku ndi mmadu,malitere mgbe educhara kibaki n iyioru dika aka na achi yabu mba,n agbanyeghi ebubo nruruaka di icheiche Raila Odinga boro ya.

 
   
 
 

Home | Contact | VON | Contact Us | archive
Webmaster@voiceofnigeria.org :Change Password :VON Staff Sign Up
Copyright© 2007. All Rights Reserved Voice Of Nigeria. Developed by: VON ON-LINE

 
 
7255KHz 41m; 9690KHz 31m; 11770KHz 25m; 15120KHz  19m